Full Lyrics
[CHORUS]
Bịa mụọ nsọ bịa
Biko mụọ nsọ bịa
Bịa biri n'obi ụmụ gị
Biko mụọ nsọ
Si n'elu igwe zitere anyị amamihe gị n'ihu anya
N'obi ndị kwere na gị
Biko mụọ nsọ bịa o
[VERSE 1]
Ị bụ aṅụrị ndị nọ n'igwe
Nkasị obi nke ndị nọ n'ụwa
Maka ndị njọ
Obi ebere
Onye n'obi ndị kwere na gị
Amamihe
Nghọta
Alo, ike, ọmụma
Obi dị ọcha na egwu nke Chukwu
[VERSE 2]
Chukwu mụọ nsọ biko kụziere anyị
K'anyị were mụọ nsọ
Kwere kwa n'ụwa ebighebi
Ka gị na nwa siri dị
[GOSPEL ACCLAMATION]
Halleluia, halleluia
Halleluia, halleluia