Full Lyrics
CHORUS
Otu ụbọchị na be gị
Otu ụbọchị na be gị ka mma
Karịa nnu ụbọchị n'ebe ọzọ
Karịa nnu ụbọchị n'ebe ọzọ.
VERSE 1
Ka m si hụ ụlọ gị n'anya Chukwu nk'igwe ndị agha
Ka mkpụrụ obi m si achọ naagbagharị maka ụlọ nke Chukwu
Mkpụrụ obi m na ahụ m naekwere Chukwu dị ndụ ukwe añụrị.
VERSE 2
Eleke achọtagọ ụmụ ya, Ayọrọ achọtagọ akwụ maka ụmụ ya
n'ebe altar gị Chukwu nk'igwe ndị agha
Eze m na Chukwu m.
VERSE 3
Añụrị bụkwa nke ndị bi n'ụlọ gị
ebeebe na ukwe otito gị,
Añụrị bụkwa nke ndị ike ha dị na gị
ndị obi ha dị na Zayọn.
VERSE 4
Otu ụbọchị na be gị ka mma
Karịa nnu ụbọchị abụọ na oguiri n'ebe ọzọ,
sọọsọ ikwuru n'ọnụ ụzọ Chukwu ka mma
Karịa ibi n'etiti ndị ajọ mmadụ.
VERSE 5
N'ihi na Chukwu bụ onye n'enye amara n'otito
Chukwu anaghị ajụ ndị n'ebi ndụ n'enweghị ụta ọbụla.
PRAYER OF THE FAITHFUL
Dinwenu, nụrụ olu anyị nụrụ arịrịọ anyị.