Full Lyrics
CHORUS
Otu nwa amụworo anyị, Otu nwa,
Eze kacha eze nile, Eze ebighị ebi.
Otu nwa amụworo anyị,
K'anyị ṅụrịa.
Immanuel abịago, Eze ebighị ebi.
Ụwa nile ṅụrịa,
Na Kristi abịago.
VERSE ONE
Onye nzọpụta ahụ, e buru n'amụma,
Eze udo, Nna ji ike nile,
Nwa Chineke ka amụworo anyị.
VERSE TWO
A g'akpọ ya Immanuel,
kpọ ya Chukwu j'ike nile,
onye ezigbo ndụmọdụ,
na onye isi udo.
Nwa Chineke ka amụworo anyị.
A g'akpọ ya Ịhụnanya,
nwa bịara inye anyị olileanya.
Okwu emere ahụ o binyere anyị.
Nwa Chineke ka amụworo anyị.
VERSE THREE
Ṅụrịa, nwa Chukwu ṅụrịa,
Ṅụrịa, Kristi abịago.
SOLO
Ṅụrịa,
Kwebe nụ ukwe aṅụrị,
Olileany'abịago.
Eze ịhụnanya,
Eze udo,
Eze g'achị ụwa nile,
ụmụnne m ṅụrịa,
Kristi abịago.