Full Lyrics
[CHORUS]
Otito dịrị Chineke n'enu kasị enu
Udo dịrị ndị mmadụ ndị nwer'obi ọma.
[VERSE 1]
Anyị ajaa gị mma, anyị agọzie gị, anyị esekpuoro gị,
Anyị etoo gị, anyị ekene gị, n'ihi nnukwu ebube gị.
Seburuụwa, Eze nke eziokwu.
[VERSE 2]
Chukwu Nna pụrụ niine, Dinwenu Jesu Kristi,
Sọ otu nwa Chineke mụrụ, Dinwenu Chukwu,
Nwatụrụ nke Chineke, nwa nke Nna.
[VERSE 3]
Gị onye n'ekpochapụ njọ ụwa, njọ nke ụwa, meere anyị ebere,
Gị onye n'ekpochapụ njọ ụwa, njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị,
Gị onye nọ n'aka nri Nna meere anyị ebere.
[VERSE 4]
N'ihi na sọ gị bụ Dinwenu,
Sọ gị Jesu Kristi kacha dị enu, gị na Mmụọ Nsọ
N'ibube Chukwu Nna. Amen.
[CODA]
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.