Otito by Alex Ugwu (OZIGE) — Lyrics

Alex Ugwu (OZIGE) Igbo Gloria Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Otito dịrị Chineke n'enu kasị enu Udo dịrị ndị mmadụ ndị nwer'obi ọma. [VERSE 1] Anyị ajaa gị mma, anyị agọzie gị, anyị esekpuoro gị, Anyị etoo gị, anyị ekene gị, n'ihi nnukwu ebube gị. Seburuụwa, Eze nke eziokwu. [VERSE 2] Chukwu Nna pụrụ niine, Dinwenu Jesu Kristi, Sọ otu nwa Chineke mụrụ, Dinwenu Chukwu, Nwatụrụ nke Chineke, nwa nke Nna. [VERSE 3] Gị onye n'ekpochapụ njọ ụwa, njọ nke ụwa, meere anyị ebere, Gị onye n'ekpochapụ njọ ụwa, njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị, Gị onye nọ n'aka nri Nna meere anyị ebere. [VERSE 4] N'ihi na sọ gị bụ Dinwenu, Sọ gị Jesu Kristi kacha dị enu, gị na Mmụọ Nsọ N'ibube Chukwu Nna. Amen. [CODA] Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

Otito

Otito

By Alex Ugwu (OZIGE)
Solfa
Igbo
1 page
0 Downloads
Gloria
0 0

More lyrics you may want