Full Lyrics
CHORUS
Otito dịịrị Chineke n'elu kacha elu
N'ụwa udo dịịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma
VERSE 1
Anyị ajara gị mma anyị agọzie gị
Anyị esekpuoro gị
Anyị etoo Gị
Anyị ekele Gị
N'ihi nnukwu ebube Gị
Oseburụwa Chukwu Eze nke eluigwe
VERSE 2
Chukwu Nna jikeniile
Dinwenu Jesu Kristi
Sọ otu Nwa Chineke mụrụ
Dinwenu Chukwu Nwa atụrụ nke Chineke
Nwa nke Nna
VERSE 3
Gị onye n'ekpocha njọ nke ụwa
Meere anyị ebere
Gị onye n'ekpocha njọ nke ụwa
Nara arịrịọ anyị
Gị onye nọ n'aka nri Nna
Meere anyị ebere
VERSE 4
N'ihi na sọ gị dị nsọ
Sọ gị bụ Dinwenu, sọ gị Jesu Kristi
Kachasị dị elu
Gị na Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna
AMEN
Amen, Amen, Amen