Full Lyrics
INTRO
Otito diri Chineke n'elu kach'elu;
N'uwa udo n'ebe ndi mmadu nwere obi oma.
REFRAIN
Otito diri Chukwu n'elu kasi elu
VERSE 1
Anyi ajaa Gi mma eh
Anyi agozie Gi
Anyi ekelee Gi n'ihi nnukwu ebube Gi
Oseburuwa Chukwu
Eze nke eluigwe
Chukwu Nna ji ike nile.
Otito diri Gi n'elu kasi elu.
VERSE 2
Dinwenụ Jesu Kristi,
sọ otu Nwa Chineke mụrụ
Dinwenu Chukwu
nwatụrụ nke Chineke
Nwa nke Nna
Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa
meer'anyi ebere
Gi Onye naekpochapụ njọ nk'ụwa
nụr'arịrịọ anyị
Gi Onye nọ n'aka nri Nna
meer'anyi ebere
Otito diri Gi n'elu kasi elu.
VERSE 3
N'ihi na sọ Gi di Nsọ,
sọ Gi bụ Dinwenu,
sọ Gi Jesu Kristi,
kachasi dị elu
Gị na Muọ Nsọ
n'ebube Chukwu Nna
Amen, Amen!
Otito diri Gi n'elu kasi elu.