Full Lyrics
REFRAIN
Otito diri Chineke n'elu kachasị
Udo diri ndị mmadụ n'ụwa
Ndị nwere obi ọma
Ma otito diri Chineke
VERSE 1
Anyị ajaa gị mma
Anyị agọzie gị
Anyị esekpuoro gị
Anyị etoo gị
Anyị ekele gị n'ihi nnukwu ebube gị
Otito diri Chineke
VERSE 2
Eze nke igwe
Chukwu majị ike nile
Dinwenu Jesu Kristi
Nwa otu nwa
Dinwenu Chukwu nwa atụrụ nke Chineke
Nwa nke Nna
Otito diri Chineke
VERSE 3
Gị onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa
Meere anyị ebere
Gị onye n'ekpochapụ njọ nke ụwa
Nara arịrịọ anyị
Otito diri Chineke
VERSE 4
Gị onye n'anọ n'aka nri nke Nna
Meere anyị ebere
N'ihina sọgị dị nsọ
Sọgị bụ Dinwenu
Sọgị Jesu Kristi kachasị elu
Gị na Muọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna
Otito diri Chineke
CODA
Amen, Amen, Amen