OTITO DIRI CHINEKE by Anozie Kelvin C — Lyrics

Anozie Kelvin C Igbo Gloria Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Otito dịrị Chineke n'elu ka si elu Udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma. [REF] Otito, otito. [VERSE 1] Anyi aja Gị mma, anyi agọzie Gị Anyi asekpuoro Gị, anyi etoo Gị, anyi ekele Gị N'ihi nnukwu ebube Gị Osebul'uwa Chukwu Eze nke eluigwe Chukwu Nna j'ike nile. [VERSE 2] Dinwenu Jesu Kristi s'Otu Nwa Chineke muru Dinwenu Chukwu Nwa aturu nke Chineke. [VERSE 3] Nwa nke Nna, Gị Onye n'ekpochapu njọ uwa Meere anyi ebere Onye n'ekpochapu njọ uwa Nara arịrịọ anyi Gị Onye nọ n'aka nri Nna Meere anyi ebere, meebere ebere. [VERSE 4] Nwa nke Nna, Onye naekpochapu njọ uwa Meere anyi ebere Onye n'ekpochapu njọ uwa Nara arịrịọ anyi Onye nọ n'aka nri Nna Meere anyi ebere, meebere ebere. [VERSE 5] N'ihi n'asọ Gị dị asọ Sọngị bu Dinwenu Sọ Gị Oh Jesu Kristi Kacha dị elu Gị na Muo Nso n'ebube Chukwu Nna Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

OTITO DIRI CHINEKE

OTITO DIRI CHINEKE

By Anozie Kelvin C
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Gloria Hymns
0 0

More lyrics you may want