Full Lyrics
CHORUS
Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu,
n'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma.
VERSE 1
Anyị ajaa gị mma, anyị agọzie gị,
anyị esekpuoro gị, anyị edo gị ebube,
anyị ekele gị n'ihi nnukwu ebube gị.
Oseburụwa Chineke, Eze nke eluigwe.
VERSE 2
Chukwu Nna ji ike niile,
Onyenweanyị Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ.
Dinwenụ anyị bụ Chukwu, Nwa atụrụ Chineke, Nwa nke Nna.
Onye naekpochapụ njọ nke ụwa, meere anyị ebere.
Onye naekpochapụ njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị.
VERSE 3
Onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere.
N'ihi na sọ ngị dị asọ, sọ ngị bụ Dinwenụ,
sọ ngị, O Jesu Kristi, kacha dị elu,
nyere Mmụọ Nsọ n'ebube Chukwu Nna.
Amen, Amen, Amen.