Full Lyrics
REFRAIN
Oseburuwa bu Onye ak'ebe m,
ezigbo dim;
ahapụrụ m nne na nna m,
bịa ka mụ na gị biri.
VERSE 1
Ihe ọbụna ị sịrị mee m
o nwunye gị k'ị na eme,
m ị jọọ, ọ bụ onwe gị k'ị n'eme,
n'ihi n'ahapụgo m ikwu n'ibe m
bịa ka mụ na gị biri.
VERSE 2
Oseburuwa gozie m,
kam meb'uche Gị Ezi Nna,
nonyere m rụkwasị anyị nma,
na k'oyi biri n'udo.
VERSE 3
Nekene kam siri hụ gị n'anya,
ihe a dị k'ịhụnanya buru,
ị me ni lam bụbụ nke gị.
VERSE 4
Chineke goziere m nne na nna m,
gozie ndị bịa rinonyere m,
chebe ha n'ofu n'ofu
o ruo obila.
Ije ba ejebe ndị iro zị ma,
adịrọzị a meo gị mma.
O! Onwe m kam n'ye Chineke
bu ony'ak'ebe.