Full Lyrics
INTRO
K'anyi jeenu na Galili ụmụnna nne m o jee lele Jesu
Onye si n'ọnwụ bilie o.
Onyiri ọnwụ k'aga akpọ ya maka na Ọ gaghị anwụkwa ọzọ.
Ọnwụ, ọnwụ, ọnwụ, ọnwụ i nweghi ike ọzọ.
CHORUS
Jesu Onyiri ọnwụ o merigo ike ọnwụ
Wee kujie mkpọrọ ili wee bilie.
VERSE 1
Alleluia n'ada n'ụwa nile Jesu emerigo
Wee nye anyị ndụ ebebe.
VERSE 2
Ọchịchịrị nile enwegị ume n'o ụwa n'uriba
N'ọchịchịrị agbasasigo.
VERSE 3
Alleluia k'anyi jeenu jee le Jesu Kristi
Ka Ọ nọzi n'ụdị anwụghị anwụ.
VERSE 4
Otito dịrị Jesu Onye nwetara anyị mmeri
Dịrị Nna na Mmụọ Nsọ ebighebi.