Full Lyrics
REFRAIN
Onye nchụaja ebebe,
Ị bụ Onye nchụaja, Onye nchụaja, Melkizedek.
Onye nchụaja ebebe,
Ị bụ Onye nchụaja, n'usoro nke Melkizedek.
VERSE 1
Osebulụwa gwara Nna m ukwu
nọdụ ala n'aka nri m
A ga m edebe, a ga m edebe
ndị iro gị niile n'okpurukwu gị.
VERSE 2
Osebulụwa g'esi na Zaịọn,
zite mkpọr'eze nke ị k'ọchịchị ya.
Chị b'ọchịchị n'etiti ndị iro gị.
VERSE 3
Ị bụ Ọkpar'eze site n'ụbọchị ọmụrụ gị
n'ugwu dị nsọ, a mụrụ ya n'ugwu
n'im'afọ ka ị nọ mgbe m weere gị ka nwa m.
VERSE 4
Osebulụwa aṅụgo iyi
Ọ gagh'agbanwe
Ị bụ Onye nchụaja ebebe
n'usoro nke Melkizedek.