Full Lyrics
[CHORUS]
Onye n'azụ m bụ Chukwu,
Chukwu nke igwe ndị agha.
Onye nanị Ya nwe ike,
Onye nanị Ya bụ Ọkaka n'ụwa ma n'igwe,
Onye nanị Ya bụ Chukwu nke igwe ndị agha,
Onye nanị Ya bụ Chukwu nke igwe ndị agha.
[VERSE 1]
Chineke naazụ m ka atụrụ n'ezi,
n'ebe ahịhịa ndụ dị ka Ọ naeme ka m narakpu,
n'eziokwu ọ dịghị ihe kọrọ m o,
n'akụkụ mmiri ndụ ka Ọ naenye m ezumike,
n'eziokwu ọ dịghị ihe kọrọ m o.
Ọ naenye, Ọ naenye ndụ na mkpụrụ obi m o,
Ọ naenye, Ọ naenye ndụ na mkpụrụ obi m o.
[VERSE 2]
Ọ naedu m n'ụzọ kwụọtọ,
Ọ naedu m, Ọ naedu m, dịka aha Ya si dị.
Ọ bụrụ na m gaaga n'ọchịchịrị egwu ọbụla agaghị atụ m o,
I ji mkpọdọ Gị nọnyere m ebe ahụ, ya ka I ji enye m agbamume,
Ọ naedu m o.
[VERSE 3]
I kwadoro m oriri n'ihu ndị iro m o,
I kwadoro m oriri n'ihu ndị iro m o,
O Jesu, ude dị mma ka I weere wee tee m n'isi,
iko m ejugo n'ọnụ.
Aga m ahụ ịdị mma Chineke n'ụbọchị ndụ m nile,
Agam ebi n'ụlọ Chineke n'ụbọchị nile nke ndụ m o.
[ACCAPELLA]
Messiah bụ Onye n'azụ m kwangbe kwangbe,
Messiah m o, Messiah bụ Onye n'azụ m,
hoo haa Ọkaka Messiah bụ onye n'azụ m kwangbe, Ọ dịghị ihe kọrọ m o,
Messiah bụ Onye n'azụ m, hoo haa Onye kere ụwa m o,
Ọkpara Chineke bụ Onye n'azụ m,
hoo haa Anyị a naarịọ ndụ bụ Onye n'azụ m, hoo haa Ọdụm nke Judah bụ Onye n'azụ m, hoo haa Onye kere ụwa m o.
[DOXOLOGY]
Otito dịrị Chukwu Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ,
Ha tọ bụ ofu Chukwu, Atọ n'otu dị ngozi,
Etu b'Ọ dị na mbụ, k'ọ dị ugbua,
K'ọ gadịgide, mgbe nile ebighebi.
Amen. Amen. Amen. Amen. Amen.