ONYE KA ONWU? by Kelvin Chinonso Anozie — Lyrics

Kelvin Chinonso Anozie Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ewo ụwa ya i ji b'ọnwụ ezi nwanne m Che'chiche ndụ gị iju ụwa bụ ahịa onye zụrụ nke y'ọ laa kwa Chịefọla n'igwe ilianyi n'abịa nso maka n'ọ dịghị onye k'ọnwụ ihe bịar'a Bịa g'alaa la o dịghị onye k'ọnwụ b'anyi dị n'eluigwe VERSE 1 Onye mak'o si bi'uwa Onye mak'osi bi'uwa Ọ bụ sọ chi nwe mmadụ nani ya ma mgbe ayi g'alaa Ony'ọbụla kwad'ọnwụ ya chere ya ọ g'abịarịrị Onye m'ony'ọ gaabụ echi Ọ bụ mụ k'ọ bụ gị Maka n'ọ dịghị onye k'ọnwụ b'anyi dị n'eluigwe VERSE 2 Mmadụ cheta n'ị bụ ntụ Mmadụ cheta n'ị bụ aja Ihe ị n'achụ ihe ị n'azọ ụwa bụ dị nk'onye Ot'ụbọchị n'abịa mgbe ị g'akwụ n'ihu ony'ikpe VERSE 3 N'aman'ọnwụ m Chukwu nna cheta m'o K'a mara Gị Chineke baara m'ụba Werihiebere gị zọpụta mụ nna Denyekw'aha m n'akwụkwọ nke ndụ

Download the sheet music

ONYE KA ONWU?

ONYE KA ONWU?

By Kelvin Chinonso Anozie
Solfa
Igbo
2 pages
5 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want