Full Lyrics
REFRAIN
Ewo ụwa ya i ji b'ọnwụ ezi nwanne m
Che'chiche ndụ gị iju ụwa bụ ahịa onye zụrụ nke y'ọ laa kwa
Chịefọla n'igwe ilianyi n'abịa nso maka n'ọ dịghị onye k'ọnwụ ihe bịar'a
Bịa g'alaa la o dịghị onye k'ọnwụ b'anyi dị n'eluigwe
VERSE 1
Onye mak'o si bi'uwa
Onye mak'osi bi'uwa
Ọ bụ sọ chi nwe mmadụ nani ya ma mgbe ayi g'alaa
Ony'ọbụla kwad'ọnwụ ya chere ya ọ g'abịarịrị
Onye m'ony'ọ gaabụ echi
Ọ bụ mụ k'ọ bụ gị
Maka n'ọ dịghị onye k'ọnwụ b'anyi dị n'eluigwe
VERSE 2
Mmadụ cheta n'ị bụ ntụ
Mmadụ cheta n'ị bụ aja
Ihe ị n'achụ ihe ị n'azọ ụwa bụ dị nk'onye
Ot'ụbọchị n'abịa mgbe ị g'akwụ n'ihu ony'ikpe
VERSE 3
N'aman'ọnwụ m Chukwu nna cheta m'o
K'a mara Gị Chineke baara m'ụba
Werihiebere gị zọpụta mụ nna
Denyekw'aha m n'akwụkwọ nke ndụ