Full Lyrics
CHORUS
Ọ bụrụ na gị Onyenweanyị,
naagụ ajọ mume anyị ọnụ,
Onyenweanyị, Onye g'eguzo?
VERSE 1
N'ugbo mmiri ka m naakpọku gị,
O Onyenweanyị.
Onyenweanyị nụrụ akwa enyemaka m naebe,
Chee ntị n'arịrịọ m naarịọ.
VERSE 2
Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị,
naagụ ajọ mume anyị ọnụ,
Onyenweanyị, Onye g'eguzo?
N'ihi nke a anyị n'asọpụrụ gị.
VERSE 3
Anam eche Onyenweanyị,
mkpụrụ obi m n'eche.
Ya na nkwa ya ka m nwere nchekwube,
mkpụrụ obi m n'eche Onyenweanyị,
karịa otu ndị nche si eche ụtụtụ.
VERSE 4
Izrel nwee nchekwube n'Onyenweanyị,
n'ihi na ịhụnanya Onyenweanyị dị okpu.
N'ime ya ka nnukwu nzọpụta dị,
ma zọpụt' Izrel na njọ ha nile.