Full Lyrics
[Chorus]
Ọnwụ emego ike ya n'eb'ị nọ n'ụwa nne m, lawa n'udo.
Zuo ike n'udo, lakwuru Chukwu Nna gị o, ka ị zuo ike.
Lawa n'ụwa nne m o, ị gaghị anwụ ọzọ.
[Verse 1]
Ọnwụ emego ike ya, ọnwụ egbuola gị o,
Ghara nụ ya nwanne m o, n'ị gaghị anwụ ọzọ.
[Verse 2]
Ihe nile ị kabu n'obi esorola gị,
Hapụ nụ ya nwanne m o, n'ị gaghị anwụ ọzọ.
[Verse 3]
Ọtụtụ okwu ị g'ekwuekwu ka dị gị n'ọnụ,
Mana hapụwa ya nwanne m na o g'ezuola.
[Verse 4]
Ụmụnne gị mere ihe nile ha nwere ike ime n'ebe ị nọ,
Mana mgbe irim gba akụkụ ela ak'ọnwụ wee kpara gị.
[Verse 5]
Ọnwụ gị bụ ọnwụ mmeri, imerie l'ansogbu,
Imerie l'ọrịa, imerie l'ahụhụ,
Imerie l'asịm sịm sịm pụta ra n'elu ụwa,
Jeezie zuo ike nwanne m o, ị gaghị anwụ ọzọ.