Full Lyrics
CHORUS
Ọnwụ dịrị anyị nile mmadụ nile
Ọnwụ kwụg'anwụ onye nta ga anwụ kwa
Jụọ nwanne gị ajụjụ ebe k'ị ga anọ m'ị nwụọ
Ugbua bụ oge gị sobe ụzọ nke Chukwu
VERSE 1
Chee echiche banyere onwe gị nwa mmadụ
Ụwa naezu otu ụbọchị gaabụkwa nke gị
Sọ gị naakpụgharị oge ncha
Lee nwanne gị ka ọ bụzi ozu tụgbọrọ
VERSE 2
Ugbua bụ oge nchegharị k'anyị hapụ ihe ụwa
Sobe ụzọ Chukwu maka na akụ n'ụb'anyị
Mma anyị nile amamihe anyị nile bụ ihe efu
VERSE 3
Cheta na ọnwụ bụ mgbanwe site n'ụwa nke a
Gawa n'ụwa ọzọ chetakwanụ
Ị gaata ahụhụ ebebe m'ị nwụọ na njọ matakwa
Ony'ọbụla nwụrụ n'ezi ihe g'enwe ndụ ebighebi
VERSE 4
Ahụghị m ihe mmadụ ji akpa nganga naakparị Chukwu
Mmadụ bụ aja, mmadụ bụ etiti, mmadụ bụ ihe efu