Full Lyrics
[INTRO]
Onyenwem Onyenwem Chim ị bụ ọmarịcha Chukwu
Daalụ oh Nna daalụ oh
Ọmarịcha Nna daalụ oh Ọmarịcha Nna
Daalụ oh Ọmarịcha Ọmarịcha Nna daalụ oh Nna
[CHORUS]
Onyenwem na
Chim omemma eh ezi Chi nechere m echiche ọma, echiche ọma
Ị mela Nna daalụ oh, ị tọgbuola m oh
Chi ọma nara ekele n'ị dịrị m mma
Ọ bụ onye dịka Gị eh Chineke
A gaeji dị onye atụnyere Gị eh Papa?
Anya afọma Gị baa ụba n'ime ndụ m oh
Ọ bụ onye dịka Gị eh Chineke Chukwu okike
Chi ọma nara ekele
Chi ọma nara otito. Amara Gị baa ụba n'ime ndụ m oh
Bịa nara ekele anyị Oke Nna
Ị bụ ọmarịcha, ọmarịcha m oh eh
Ọmarịcha, ọmarịcha Eze m oh
Ọmarịcha, ọmarịcha m oh eh Ọmarịcha
Ọmarịcha Daddy m oh, Chimarobi m oh
Ọmarịcha ọmarịcha ọmarịcha eh
Bịanụ lelenụ Chineke anyị bụ ọmarịcha
[VERSE 1]
Ezi Chukwu atọgbuo m oh
Ezi Chukwu atọgbuo m oh
Ezi Chukwu atọgbuo m oh
N'ezie n'ezie n'ezie ọ bụ ọmarịcha
Ọmarịcha ka Chi anyị bụ ụmụ ụwa
Ọ bụ ọmarịcha ọmarịcha
Lelenụ a kpọrọ m Ya Ọ za m eh
Ọ nyere m ahụike oh
Onye gaemediri m ih'Ọ naeme?
Nna ị bụ
[CHORUS]
Ọmarịcha Ọmarịcha m oh
[VERSE 2]
Ngọzi dịrị Chukwu Nna
Jesu Ọ naeme mma eh
Ọ j'ihe ọma agọzi anyị
Ma sị anyị ribe ife oh
Sị anyị nwebea ṅụrị n'elu ụwa
Ọ gịnị k'anyị g'emere O bi n'igwe
K'anyị tuoro Ya mma mma
Sị Ya ọmarịcha ndewo oh ị meka
[VERSE 3]
Nyenụ Dinwenụ m otito kwesịrị Ya eh
N'ojija kwesịrị aha nsọ Ya
N'ihu ekwuaja Ya dị nsọ
K'anyị buru onyinye anyị bịa n'ihu nke Chukwu
Ọ gaagọzikw'anyị
Anye oh Papa m, anye oh Eze m
Anye oh Daddy m, anye oh Deede m
K'anyị sị Ya mma mma ị mela