Full Lyrics
CHORUS
Ih'ukwu emego na Bethlehem ah
Eh ihe d'iegwu'emego na Bethlehem eh
Ih'ukwu emego na Bethlehem ah
Eh ihe d'iegwu'emego na Bethlehem
Ngwa k'anyị jeebe lee
Bịanụ lee oh
Bịanụ lee
Mary'amụgo nwa
Nwa bụ Jesu
Eze ndị eze
Bịa nụ k'anyị jee nụ Bethlehem
Eb'a mụrụ ọmalịcha Nwa
VERSE 1
Ihe dị egwu mer'eme o, mer'eme
Amụma Aịzaya buru emezu
Na nwanyị n'amaghị nwoke g'amụr'anyị nwa
Aha a g'akpọ Ya bụ Emmanuel ọmalịcha
Ngwa lelee
VERSE 2
Eze amụrụ ọhụrụ
Eh I bịala
Eh ọmalịcha nwa Emmanuel nnọọ
VERSE 3
Atụmatụ Herod egbochighị ọmụmụ Kristi
Eze k'eze
Mary amụọ eh ọmalịcha nwa
VERSE 4
Ọmalịcha Nwa, Nwa ka nwa ọmalịcha Nwa
Ez'udo
Ez'ụwa n'ile
Eze ndị eze
Ọkpar'udo
Ụwa nweb'añụrị
Onye nzọpụt'a bịago
Eze k'eze
Emmanuel
Eze dị ebighịbi
Ez'amụrụ ọhụrụ
Ọmalịcha nwa
Nwa ka nwa ọmalịcha nwa
Bịanụ lee