OLISA by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

INTRO K'anyi kelee Ya n'oruolu Ya. Kelee Ya n'okwesiri Ya. Kelee Ya n'oziere Ya. Kelee Ya, kunie k'anyi kelee Ya n'oruolu Ya. Kelee Ya. Jee jaa Ya mma! Tobe Olisa nk'igwe kele Chineke. REFRAIN K'anyi kelee, kelee Olisa, K'anyi jee jaa Ya mma. K'anyi kelee, kelee Olisa nk'igwe! Chineke mo! Ọ gwaka eje ọgụ. Ọ bụ Ya n'eche obodo mo! Ọ bụ Ya n'echel'umba mo! Olisa egboo! Olisameka, Olisebuluwa nma nma. Ọ ziere Gị! Ekele diiri Gị! Otito diiri Gị! Ebube biko narekele, Olisa doo! Olisa I melaa! Ihe diebube k'I neme! Ih'imere juru m afọ! Ih'imere juru m anya! Aka m di n'elu! Ọ ruolu Gị. Ekele diri Gị! O kwesiri Gị. Otito diri Gị! Olisa ziere Gị. Igwe n'echendo mo! Aka m di n'elu! Ọ ruolu Gị. Ekele diri Gị! Ọ kwesiri Gị! Otito diri Gị, Ọ ziere Gị, Chi n'eme nma! VERSE 1 Udara dara n'ala emetugo aja. Azụ bi na mmiri adịgh'agụụ mmiri. Anyi bi n'uwa, njọ zur'anyi ahụ. Onye njọ ka m bụ, ma n'Olisa elegh'anya na njọ mo. Ọ nwụr'ọnwụ n'obe, Ọnwụ Ya k'ojiri zọọ mo. Keleeleelee nu o! VERSE 2 Chukwu kere nwoke, agagh'ekwe ka nwanyi taa ahụhụ. Chi n'akpa mo, I n'egboro m mkpa mo! Onyiny'I nyere mo ba r'uba. Nna, ya ka m ji eme ọnụ. Agụ n'eche mba mo, Olisa Imeka. Keleeleelee nu o! VERSE 3 Nwa n'esọ Okenye ọ tagh'ọsọ ọ taa ọjị, makana aka n'agba n'akụkụ ọkụ n'agalụwa n'akụkụ ọnụ. Onye n'esọ Gị Chineke, onwer'ihe nile. Olise buluwa n'azụ mo, Ọ dighi ihe kọrọ mo. Ochendo mo! Agụ bata mgbad'awara ọsọ! Keleeleelee nu o!

Download the sheet music

OLISA

OLISA

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
26 Downloads
Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns Celebrations
1 0

More lyrics you may want