Full Lyrics
INTRO
K'anyị kelee Ya n'ọrụọlụ Ya.
Kelee Ya n'okwesịrị Ya.
Kelee Ya n'oziere Ya.
Kelee Ya.
Kunie k'anyị kelee Ya n'ọrụọlụ Ya.
Jee jaa Ya nma!
Tobe Olisa nk'igwe, kele Chineke mo!
REFRAIN
K'anyị kelee, ke lee Olisa, k'anyị jee jaa Ya nma.
K'anyị kelee, ke lee Olisa nk'igwe!
Chineke mo!
Ọgba aka eje ọgụ!
Ọ bụ Ya n'elekọta mo!
Ọ bụ Ya n'echekwaba mo!
Olisa e gboo!
Olise me ka!
Olise buluwa nmanma, biko nar'ekele.
Olisa doo!
Aka m me!
Ma iru m'azụ m, ihe dị ebube!
Ọ juru m'anya!
Aka m dị n'elu!
Ọrụọlụ Gị.
Ekele dịrị Gị!
Okwesịrị Gị.
Otito dịrị Gị!
Oziere Gị.
Igwe n'eche ndụ mo!
Aka m dị n'elu!
Ọrụọlụ Gị.
Ekele dịrị Gị!
Okwesịrị Gị.
Otito dịrị Gị!
Oziere Gị.
VERSE 1
Chi n'eme nma!
Ụdara dara n'ala, emetugo aja.
Azụ bi na mmiri adịgh'agọ agụgọ mmiri.
Anyị bi n'ụwa, njọ zur'anyị ahụ!
Onye njọ kam bụ, man'Olisa elegh'anya na njọ mo.
Ọ nwụr'ọnwụ n'obe, Ọnwụ Ya k'ojiri zọọ mo.
Kelee lee lee nuo!
VERSE 2
Chukwu kere nwa agụ agagh'ekwe ka nwa agụ taa' hihia.
Chi ma mkpa mo, I n'egboro m mkpa mo!
Onyiny'Inyere mo bar'ụba.
Nna, ya kam ji eme ọnụ, ya kam ji eme ngala.
Agụ n'eche mba mo, Olisa imeka.
Kelee lee lee nuo!
VERSE 3
Nwa n'eso okenye, ọtagh'ose ọtaa ọjị, makana aka n'aga n'akụkụ ọkụ, n'agakwa n'akụkụ ọnụ.
Onye n'eso Gị n'azụ Chineke, O nwer'ihe nile.
Olise buluwa n'azụ mo, Ọ dịgh'ihe kọrọ mo.
Ochendo mo!
Agụ bata mgbad'a war'ọsọ!
Kelee lee lee nuo!