OLISA by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] K'anyi kelee ya n'ọrụọlụ ya, Kelee ya n'okwesiri ya. Kelee ya n'oziere ya. Kelee ya, kunie k'anyi kelee ya n'ọndụ ya. Jee jaa ya mma, kelee ya. Tobe Olisa nk'igwe, Kele Chineke nke igwe ndị agha. K'anyi jee jaa ya mma, K'anyi kelee, kelee Olisa nk'igwe. Chineke m o! I baa ka e je ogu! Ọ bụ ya n'elekọta m o! Ọ bụ ya n'echekwaba m o. Olisa egboo! Olisa emeka! Olisa bulu wa m ma mma, Biko nare kele. Olisa doo! Ihe ebube k'i n'eme! Nna i rum azụ m, Ihe di ebube o juru m anya! Aka m dị n'elu! Ọrụọlụ gị. Ekene dịrị gị! O kwesịrị gị. Otito dịrị gị! O ziere gị. Igwe n'echemba m o! Aka m dị n'elu! Ọrụọlụ gị. Ekene dịrị gị! O kwesịrị gị. Otito dịrị gị! O ziere gị. Chi naeme mma! [VERSE 1] Ụda m dara n'ala emetụ gwaja, Azụ bi na mmiri adịghị agọ gụgọ mmiri. Anyị bi n'ụwa, njọ zuru anyị ahụ! Onye njọ ka m bụ ma n'Olisa eleghị anya na njọ m o. O nwere ọnwụ n'obe, Ọnwụ ya k'o jiri zọọ m o. Kelee, lee, lee nụ o! Olisa bi n'igwe, ị karị sịrị! Nare kel'anyi o. [VERSE 2] Chukwu kere nwa n'agụụ, A gaghị ekwe ka nwa gụụ taa n'ọhịa. Chi ma mkpa m o, Ị n'egboro m mkpa m o! Onyinye inyere m o, ọha n'ụwa, Ya ka m jie me ọnụ, Ya ka m jie me ngala. Agụ n'echemba m o, Olisa imeka. Kelee, lee, lee nụ o! Olisa bi n'igwe, ị karị sịrị! Nare kel'anyi o. [VERSE 3] Nwa n'eso okenye, Ọ taghọ se otaa ọjị, Maka na a kan'a ga n'akụkụ ọkụ, N'agakwa n'akụkụ ọnụ. O nyere sọ gị n'i Chineke, O nwer'ihe ọ n'ele. Olisa bi l'ụwa n'azụ m o, Ọ dighi ihe kọrọ m o. Ochendo m o, Agụ bata mgbada wara ọsọ! Kelee, lee, lee nụ o! Olisa bi n'igwe, ị karị sịrị! Nare kel'anyi o.

Download the sheet music

OLISA

OLISA

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want