Full Lyrics
[REFRAIN]
Jesu Kristi bu okwute ndu,
Jesu b'okwute,
Jesu b'okwute ndu,
Okwut' a loju raju,
Onye nwuru anwu,
Onye n'ebube!
Onye si n'onwu bilite, Ide!
N'Osebuluwa ihe nile,
Ide! N'Osebuluwa ihe nile.
[VERSE 1]
Kristi bu nkume ntoala,
Odighi ozo Chineke toro.
Chineke toro, O mere ya
Onye nzoputa na Onyikpe.
[VERSE 2]
I kwubere nzuko Gi Kristi
N'ebu okwute di okpu
Ka o buru ama nkwudosike
N'agbata Gi na mmadu.
[VERSE 3]
Anyi nile amunworo ta,
B'okwute di okpuru
Ejiri wuo ulo na Muo Nso
Bu eb'obi Chineke.
[VERSE 4]
Ndi ji ngala agaru be ya
Asongong n'iru ya.
Ndi nile kweghekwe n'kuma hu
G'egwepia.
[VERSE 5]
Okwute, Okwute, Okwute,
Okwute n'echedo n'agha, Jesu!
Ike mo, Onyem ji em'onu Jesu!
Ikenganga mo, Onyem ji em'onu Jesu!
Nye mmiri ndu Onyem ji em'onu Jesu.
Nganga mo, Onyem ji em'onu Jesu.
[VERSE 6]
N'ime nkwudosike Gi iso ngongo n'akwusi,
Ezi omume ngongo ha nile n'akwusi.
Omume di ngongo, i so ngongo n'akwusi.
Ezi omume di ngongo i so ngongo n'akwusi.
Omume di nma ikpenkwumoto n'adigide;
N'adigide; Gi n'edu anyi n'eluwa.
Ha n'alarii, na ikpenkwumoto n'adigide,
Digide ebighebi,
Digide ebighebi,
Digide ebighebi.