Full Lyrics
[REFRAIN]
Jesu Kristi bụ okwute ndị ụlọ jur'ajụ.
Onye nwụr'anwụ, si n'ọnwụ bilite.
Ide! N'Osebulụwa ihe niile.
[VERSE 1]
Kristi bụ nkume ntọala ọ dịghị ọzọ Chineke tọrọ.
Isi mbido na njedebe, nzọpụta na Ony'ikpe.
[VERSE 2]
Ị hụbere nzụkọ Gị, Kristi, n'elu okwute dị okpu;
ka ọ bụrụ ama nkwụdosike n'agbata Gị na mmadụ.
[VERSE 3]
Anyị niile amụnworo la, b'okwute dị ok'ọnụ,
ejiri wuo ụlọ na Mmụọ Nsọ bụ eb'obi Chineke.
[VERSE 4]
Ndị ji ngala agarube g'asọ ngọngọ n'iru Ya.
Ndị niile ekwegh'ekwe, nkum'ahụ g'egwepịa.
[VERSE 5]
Okwute, Okwute, Okwute!
Okwute n'echedo n'agha, Jesu! Ike! Ike nganga mo.
Okwute n'enye mmiri ndụ, Onye m ji em'ọnụ!
Nime nkwụdosike Gị, isọ ngọngọ n'akwụsị,
ezi omume na ikpe nkwụmọtọ n'adịgide,
n'adịgide ebigh'ebi.