OGECHUKWU (GOD'S TIME) by Emeka Ujam S. (Emyrald) — Lyrics

Emeka Ujam S. (Emyrald) Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Oge Chineke nna ka mma, oge ya ka mma Chukwu mere ya n'oge ya, k'anyị kelee nụ Chukwu onye n'enye anyị ny'ọma, mma ma bịa k'anyị kelee nụ Chukwu k'anyị kelee Chineke onye n'onyinye nke Chukwu nyere anyị kacha mma n'oge ya. VERSE 1 Bute ikinwere bịa k'anyị kelee Chukwu, Chukwu dị mma Bute nụ onyinye si n'obi ewo! gịnị ka ị n'eche? bunye ya Ide ji ndụ m o, but' onyinye gị bịa kelee ya, Ide ji ndụ m o, but' onyinye gị kunita ọdịghị aghagha o ekwu eme ọ naghị agharịpụ. VERSE 2 Chukwu fụlụ gị n'anya ọ n'emere ị ihe ọma ọ n'edu gị ije ma duru gị laa, lee oge onyinye rugo bịa nye y'onyinye marabuba enyekwala ya nwantịntị ego. VERSE 3 Oge Chineke nna ka mma m'ọ dị mma m'ọ dị njọ, m'ị nwe ego m'ị dara ogbenye, mahụ ike mahụ ọnwụnwụ nwannem Chukwu fụlụ gị n'anya, ọ gozie gị kelee ya kelee ya. VERSE 4 Nwe ndidi chere oge Chukwu maka na nkịta nwere ndidi n'eria azụ ukpo, mmiri zoche n'anwụ g'amarịsị e kwerem ekwe n'ọlụ, egbeigwe g'ada ma ọ g'adajụọ na ekwerem n'oge Chineke ka mma. Ị kpego ekpere, ị bu gọ nụ ị mego opipia, ị chụgo aja nke si n'obi gị, nwannem chere oge Chukwu ọ g'aza gị ekpere abụ otito g'eju kwa n'ọnụ gị.

Download the sheet music

OGECHUKWU (GOD'S TIME)

OGECHUKWU (GOD'S TIME)

By Emeka Ujam S. (Emyrald...
Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want