Full Lyrics
CHORUS
Oge Chineke nna ka mma, oge ya ka mma Chukwu
mere ya n'oge ya, k'anyị kelee nụ Chukwu onye n'enye anyị ny'ọma,
mma ma bịa k'anyị kelee nụ Chukwu k'anyị kelee Chineke onye n'onyinye
nke Chukwu nyere anyị kacha mma n'oge ya.
VERSE 1
Bute ikinwere bịa k'anyị kelee Chukwu, Chukwu dị mma
Bute nụ onyinye si n'obi ewo! gịnị ka ị n'eche? bunye ya
Ide ji ndụ m o, but' onyinye gị bịa kelee ya,
Ide ji ndụ m o, but' onyinye gị kunita ọdịghị aghagha o
ekwu eme ọ naghị agharịpụ.
VERSE 2
Chukwu fụlụ gị n'anya ọ n'emere ị ihe ọma ọ n'edu gị ije
ma duru gị laa, lee oge onyinye rugo bịa nye y'onyinye marabuba
enyekwala ya nwantịntị ego.
VERSE 3
Oge Chineke nna ka mma
m'ọ dị mma m'ọ dị njọ, m'ị nwe ego m'ị dara ogbenye, mahụ ike mahụ ọnwụnwụ
nwannem Chukwu fụlụ gị n'anya, ọ gozie gị kelee ya kelee ya.
VERSE 4
Nwe ndidi
chere oge Chukwu maka na nkịta nwere ndidi n'eria azụ ukpo,
mmiri zoche n'anwụ g'amarịsị e kwerem ekwe n'ọlụ, egbeigwe g'ada ma ọ g'adajụọ na ekwerem n'oge Chineke ka mma. Ị kpego ekpere, ị bu gọ nụ
ị mego opipia, ị chụgo aja nke si n'obi gị, nwannem chere oge Chukwu ọ g'aza gị ekpere abụ otito g'eju kwa n'ọnụ gị.