Full Lyrics
CHORUS
Oge erugo, oge erugo,
Oge erugo ụmụnna n'iru altar,
Onye n'eny' udo,
K'anyị sekpuere Onye n'eny' udo,
Onye n'eny' udo.
VERSE 1
Bịanụ k'anyị oje o,
Bịanụ kpọọ isi ala nye Chineke bụ Chukwu,
Ọ bụ Ya b'ọkaka,
Kpọọ isi ala nye Ya.
VERSE 2
Bịanụ k'anyị too Chukwu,
Bịanụ kpọọ isi ala nye Chineke bụ Chukwu,
Ọ bụ Ya b'ọkaka,
Kpọọ isi ala nye Ya.
VERSE 3
Bịanụ k'anyị kelee Chukwu,
Maka ihe ọma ọ n'eme anyị,
Chineke kwesịrị ekele,
Bịanụ kpọọ isi ala nye Ya.
VERSE 4
Bịanụ k'anyị yọọ Ya mgbaghara,
Maka njọ anyị,
Chineke bụ Nna o bi n'obi ebere,
Bịanụ kpọọ isi ala nye Ya.
VERSE 5
Bịanụ k'anyị zukọta kọọrọ Ya mkpa anyị,
Chukwu dị ebube n'az' ekpere,
Chineke ma zuru mkpa gị niile,
Bịanụ kpọọ isi ala nye Ya.