Full Lyrics
CHORUS
Oge erugo ee, Oge erugo ee,
Ụmụnna zukọtanụ n'iru alter Oge erugo.
K'anyi sekpuere Osebulụwa
Chukwu Onye n'eny'udo.
VERSE 1
Bianụ sekpuere Chukwu
Bianụ k'anyi tobe
Bianụ, kpọọ isiala nye ya
Chineke bụ Ya
Bianụ ụmụ Chineke
Bianụ doo kelenụ Chukwu
Chineke bụ isi
Bianụ kpọọ isiala
K'anyi tobe Ya
Kpọọ isiala nye ya.
VERSE 2
Bianụ k'anyi too Chukwu
Bianụ werukwe too ya
Chineke bụ ya bụ Eze.
VERSE 3
Bianụ k'anyi kele Chukwu
Maka ihe rile ọ n'emer'anyi
Chineke kwesiri ekele.
VERSE 4
Bianụ k'anyi yọọ Ya mgbaghara njọ
Mee bere maka njọ anyi
Chineke bụ Nna obi ebere.
VERSE 5
Bianụ k'anyi zukọta kọọr'a Ya mkpa r'anyi
Chukwu di ebube n'az'ekpere
Chineke mazuru mkpa di nile.