ONYINYE SIRI N'EZI OBI by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Bute onyinye'obi ọcha. Bute onyinye mara nma, ọ bụ ya n'asọ Chukwu. Onyinye siri n'ezi obi gị pụta, mgb'obi gị dị ọcha, buru ya bịa n'iru Chineke. VERSE 1 Ngọzi Chukwu dị n'ụdị, n'ụdị, onyinye Y'aba k'ụba. O nwere ndị o nyer'onyinye nk'akụ n'ụba, nwee ndị O jiri onyinye'ọmụmụ gọzie! Ụwa ezuoke nwanne m o, nk'O nyere gị nara, yọbanụ Ya ma kwe re, O g'agọzikwa gị. VERSE 2 Ony'ayịyọ nọ n'iru gị. I kuchab'akpa chọb'ober'ego, ọkwa nke kach'obere! Ichezọgọ na Chukwu n'ele gị? I sekpuru n'iru Chineke wee yọọ Y'ayịyọ, O si etu ahụ mee gị, obi ọ g'adịkwa gị nma? VERSE 3 I bu mkpa gị nile, wee bịa n'ụlọ nsọ Chukwu. O g'onyiny'erugo, I nyochab'akpa, chọb'ober'ego! Ọ bụrụ na Chineke buru ngọzi Ya bata; kee ya k'esi ny'onyinye, ọ kw'ita b'onwe gị ụta?!

Download the sheet music

ONYINYE SIRI N'EZI OBI

ONYINYE SIRI N'EZI OBI

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
6 pages
9 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want