Full Lyrics
VERSE 1
Chukwu ker'uwa, kee igwe, k'anyi jenu bugara ya.
Chukwu ker'uwa, choo ya nma, k'anyi jenu bugara ya.
O bu Ya kere kpakpando, kee onwa, kee anyanwu.
Okike nile, kunite nu o k'anyi bugaranu Y'onyinye.
REFRAIN
Eh, ezi nwanne m o ony'onyinye, bute ya, ngwangwa!
Ngwanu k'anyi we r'oji, chita ji n'ede,
I nwere ewu, kputa ya. Onye nwere efi kpuru biaba!
N'obi Chineke k'anyi n'aga.
Ngozi n'adiri ndi n'eny'onyinye n'obi ocha.
Ha g'ahukwa ngozi Chineke n'ime ndu ha, n'ezi n'ulo ha.
Ha g'anat'amara nke si n'igwe n'uju.
VERSE 2
Chukwu kechara mmadu n'oyiyi Ya,
O kere anumanu, kee ihe nile,
were ha kp'anyi n'aka.
Ma azu bi na mmiri, ma an'ufe nke eligwe,
Okike nile, kunite nu o k'anyi bugaranu Y'onyinye.
VERSE 3
Ihe oma nile si n'aka Chukwu.
Aku n'uba gi si n'aka Chukwu.
Makana olu nile nwer'ugwo, ka n'uwa, ka n'igwe.
Okike nile, kunite nu o k'anyi bugaranu Y'onyinye.
VERSE 4
Ume anyi n'eku sikwa n'aka Ya bia.
Ikuku anyi n'ekuru mgbe nile, n'akwugh'ugwo.
O nyere gi ndu n'ahu ike, ma choo gi nma.
Okike nile, kunite nu o k'anyi bugaranu Y'onyinye.