Full Lyrics
REFRAIN
Bulie Yelu tuo Y'igwe oh n'eme mma eh
Ọ bụ Ezeọra
Bịa nụ soro mu nye Chukwu ekele
bulie Ya elu eh
n'Ọ bụ Ezeọra
Chi n'eme mma eh
Ababa Nna ndewo eh
nara ekele m eh
Ababa Nna ndewo eh
ih'imere dị anyị mma eh
Ababa Nna ndewo eh
Ya kam ji n'ekele
Ababa Nna ndewo eh
VERSE 1
Ekuliri m ụra n'ụtụtụ
lelie anya n'eligwe were sị Ọkaka
Mba nile toonu Ababa Nna ma kpọọ Ya
Onyeukwu omemma k'Ọ bụ
Onyeukwu ndewo eh
Ọ wee sị m nwa m bu n'obi kunite riwe ngọzi
si n'igwe m wee sị Ya Nna
Ababa Nna dewo eh
VERSE 2
Ọ bụrụgodu n'ụwa asịghị m kọwa ihe Chukwu n'emere m'oh
a ga m'etiwe mkpu n'okeolu were kwusaba
ịdị mma Chukwu.
Ụmụnne m bịa nụ ka m kọba ihe Chukwu n'emere m'oh
ihe o mere m ji asị ya
Ababa Nna ndewo eh
VERSE 3
Kemgbe m lechara ihe ọma o n'eme
n'ezie obi dị m'ụtọ
ihe ọm'omere n'agba m anyammiri
Nna ndewo eh
Ụmụ Chineke le
ndị ihe ọma na adị mma
soro m ka anyị jee sị Chineke
Ababa Nna dewo eh