Full Lyrics
REFRAIN
Ochiagha nke eligwe Chineke di ndu mere anyi ebere,
Mere anyi ebere Chineke kere uwa nile doo.
VERSE 1
Nwa nke mmadu, nyochako n'uche gi
Hu ihe Chukwu n'emere gi,
Kele Ya, bulie ya elu,
Mgbe ebighiebi anyi o.
VERSE 2
Chineke Nna, anyi n'ekele gi
Maka iheoma i n'emere anyi o,
Ezi Nna, Onye obi oma,
Nara ekele anyi o.
VERSE 3
Ekele di mma kwesiri inye Chineke,
Onye di mma Chineke,
Nna Onye ebere,
Onye kere uwa jaa ya mma eh.