Obimma by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Entrance songs Hymns Responsorial Psalms Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Chineke, lee ka ebe obibi Gị si maa nma. REFRAIN Obimma! Obi mara nma, Obi Chukwu! Obi dị nsọ! Anyị abịago n'obi Gị! Wusaba anyị ngozi Gị, Chineke, Igwe ndị agha. Ndị Gị abịago n'iru Gị! Wusaba anyị ngozi Gị, Chineke nke Igwe ndị agha. VERSE 1 Otu bọchị na be Gị, Chineke, kacha nma. Karịchaa nụ kwuru nnu n'ebe ọzọ. VERSE 2 Ọ naagụm nnukwu agụụ ịbata n'obi Dinwenu. Mkpụrụ obi m na ahụ m naekwere Chineke dị ndụ ukwe añụrị. VERSE 3 Nnụnụ eleke achọtarala onwe ya ebe obibi. Kpalakwukwu achọtagakwuo maka ụmụ ya N'ebe Nchụaja Gị, Chukwu nke Igwe ndị agha, Eze m na Chukwu m. VERSE 4 Añụrị bụ nke ha, ndị bi n'obi Gị, Naekwere Gị ukwe otito ụbọchị niile.

Download the sheet music

Obimma

Obimma

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
119 Downloads
Entrance songs Hymns Responsorial Psalms
0 0

More lyrics you may want