OBIMMA by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Entrance songs Psalms Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Chineke, lee ka ebe obibi Gị si maa nma. REFRAIN Obimma! Obi mara nma, Obi Chukwu! Obi ndinso! Anyị abịago n'obi Gị! Wusabanyị ngozi Gị, Chineke, Ngozi n'adịrị ndị bịara n'obi Gị. Wusabanyị ngozi Gị, Chineke nke Igwe ndịgha. Ndị Gị abịago n'iru Gị! Wusabanyị ngozi Gị, Chineke, Igwe ndịgha. VERSE 1 Otu ụbọchị na be Gị, Chineke, kacha nma. Karịcha nnu kwuru nnu n'ebe ọzọ. VERSE 2 Ọ n'agụm nnukwu agụụ ịbata n'obi Dinwenu. Mkpụrụ obim n'ahụm, naekwere Chineke dị ndụ ukwe an̄ụrị. VERSE 3 Nnụnụ elekachachọtarala onwe ya ebe obibi. Kpalakwukwu achọtagakwu maka ụmụ ya N'ebe Nchụaja Gị, Chukwu nk'Igwe ndịgha, Ezem na Chukwum. VERSE 4 An̄ụrị bụ nke ha, bụ ndị bi n'obi Gị, N'ekwere Gị ukwe tito ụbọchị niile.

Download the sheet music

OBIMMA

OBIMMA

By JUDE NNAM
Solfa
Igbo
2 pages
10 Downloads
Entrance songs Psalms Hymns
0 0

More lyrics you may want