OBILIGO by Samuel Nwezeigwe — Lyrics

Samuel Nwezeigwe Igbo Easter Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Kristi ebiligo n'ọnwụ ezie Nwa ebiligo n'ọnwụ Onye nzọpụta ebiligo n'ọnwụ Alleluia Kristi emerigo ọnwụ Ligo n'ọnwụ Alleluia Chukwu nwa ebiligo n'ọnwụ VERSE 1 N'elu obe Calvary k'a pịawa ya ihe N'elu obe Calvary k'e kpuru ya okpu ogwu N'elu obe Calvary k'a kpọgburu dinwenum O dinwenum Eze anyị ebiligo VERSE 2 Ụwa nile kwebenu alleluia Dinwenum ebiligo Tibenụ egwu k'anyị nwabe nnukwu aṅụrị Tibenụ egwu, egwu ọṅụ Nwe ndụ ebiligo Aṅụrị, nwe ndụ ebiligo REFRAIN Obiligo, Chinwe ndụ ebiligo Obiligo n'ọnwụ, ebiligo Obiligo n'ezie k'osiri kwuo Nwe ndụ ebiligo Ọnwụ enweghị ike ọzọ ịchị Olee kwanụ ike gị Alleluia Chukwu Kristi Onye nwerigo alleluia

Download the sheet music

OBILIGO

OBILIGO

By Samuel Nwezeigwe
Solfa
Igbo
3 pages
2 Downloads
Easter Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want