Full Lyrics
REFRAIN
Heh! Obiligo Eh! Obiligo!!
Kristi emerig' ọnwụ
Ọnwụ na nji omerigo
K'anyị ṅụrịbanụ butenụ egwu ọma n'opi ike
Gbabaranụ y'egwu
Kristi Dinwen'anyị omerigo
Ike ekwensu adagọ mba
Odogwu n'agha, aka n'ebu agha
Odogwu n'agha, o like jogu!
Omerigo
Nwa Chineke guzo n'ogo
Nwa Chineke omerigo
Osise n'mbe nile
VERSE 1
Na Gethemani Kristi ruru ju
Ụta n'apịara ya
Ọkwara akwa ha akpọgbue ya n'obe
Omerigo
VERSE 2
N'ụzụtụtụ, mgbe anwụ wara
N'ụbọchị nke atọ
Ụmụ nwaanyị gara n'ili mana ha hụghị ya
Ha gara chọọ Jesu chọọ ya n'ala ndị nwụrụ mana ha hụghị ya
Ha chọrọ y'ebe chọọ ya n'ala chọọ ya n'ugwu chọọ y'ebe nile
Ha wee bee ha wee kwasi ha n'achọ ya
Ọ gbaghara wee dị akwa n'iri wee ju n'obi ha n'ebe ma mana ha hụghị ya
VERSE 3
Otu mmụọzi kwuru n'ụzọ wee sị ha
Ṅụlịbanụ Kristi Dinwen'unu ebiligo
Ọ bụrụ g'unu gaba na Galili
Gabanụ ga gwa ụmụazụ ya
VERSE 4
Aka nri Chukwu emeriele
Aka nri y'eweli la m'elu
Ọnwụ olee ike gị, ọnwụ olee ike gị
Onye gburu egbu lee ya n'ala
Ọnwụ ked'ike gị e?
Kristi bụ onye nwenmeri
Wer' okwukwe kpochite ya
Obiligo Alleluia Alleluia
Omerigo