Full Lyrics
REFRAIN
Ebe a bu ebe di egwu!
Nke a bu Ulo Nso Chukwu,
On'uzo nke eligwe.
A g'akpo ya, Obieze Chukwu di Nso.
VERSE 1
O Nna ji ike nile,
anyi abiago ikpo isiala nye Gi.
Meere anyi ebere.
Anyi biara n'obi Gi Chukwu.
VERSE 2
Anyi biara n'iru Gi, Chineke,
inye Gi ekele kwesiri Gi.
Gee nti, nur'ekper'anyi.
Anyi biara n'obi Gi Chukwu.
VERSE 3
Gee nti, nuru olu anyi.
Gee nti, nur'aririo anyi.
Denye ah'anyi n'akwukwo ndu.
Anyi biara n'obi Gi Chukwu.
VERSE 4
Anyi ga efe Gi uwatuwa.
Biko, Chukwu, mee k'anyi binyere Gi.
Ka ngozi Gi rukwasi anyi, Chineke.
Anyi biara n'obi Gi Chukwu.