OBIBIA MUO NSO (Penticost/Sequence) by L. C. Ekemezie — Lyrics

L. C. Ekemezie Igbo Pentecost Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[Intro] Bịa o Mmụọ kachasị nsọ, Si n'eligwe zidata ìhè Gị n'obi anyị. Bịa, bịa, bịa, O Nna ndị ogbenye, K'ị nye anyị onyinye, Bịa, a bụrụ ìhè nke obi. [Verse 1] Onye ntasi obi bịa, Bụ onye ọbịa dị ụtọ, Onye n'enye atụụri ezumike. Ma ike gwụ, oyi n'oge kpọmọkụ, N'oge ekpọmọkụ, ntasiobi na nsogbu. [Verse 2] O ìhè mmụọ dị ngozi, Chabata, chabata n'ime obi ndị niile kwere na Gị. Ewepụ onyinye Gị, Gịnị fara na mmadụ? Onweghị ihe g'adị mma. [Verse 3] Sachapụ atụtụ njọ, Sachapụ atụtụ njọ, Gbaa mmiri n'obi dị ọkụ, Gwọọ ọrịa nke naarịa anyị. Hulata obi isi ike, Hulata obi isi ike, Kpanite obi jụrụ oyi, Ji chie ukwu n'agahie. [The End] Nye ndị kwere n'okwu Gị, Ndị chekurubere na Gị, Onyinye asaa nke Gị. Mgbe anyị ji g'ahapụ ụwa, Mgbe anyị ji g'ahapụ ụwa, Duba anyị n'añụrị ebebe. Amen, alleluia, alleluia, alleluia.

Download the sheet music

OBIBIA MUO NSO (Penticost/Sequence)

OBIBIA MUO NSO (Penticost/Sequence)

By L. C. Ekemezie
Solfa
Igbo
5 pages
52 Downloads
Pentecost Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want