OBIAGELI by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Responsorial Psalms Staff & Solfa notation

Full Lyrics

Refrain I goziwo mo, Chineke, Chukwu mara nma. Aga m'ebur'aku, bur'onyinye bia n'iru Gi. Maka n'Imego m Obiageli! Mkpur'obi mo n'aja Gi nma. Odigh'ihe koro m. Onwegh'ihe m g'acho. Aga m'ebur'aku, bur'onyinye bia n'iru Gi. Imego m Obiageli! Mkpur'obi mo n'aja Gi nma. Verse One Dinwenu, I naazu m ka aturu, odigh'ihe koro m. N'ebe ahihia ndu di n'uju I n'eme ka m makpuru. I n'edu ga m na mmiri do r'e do, ka muo m zu r'i ke. Odigh'ihe m g'acho, n'ezie, odigh'ihe koro mo. Verse Two I n'edu m n'uzo kwu oto, n'ihi Aha Gi, Nna. Oburugodu na m n'aga na ndagwurugwu onwu, Ujo anagh'atukwa mo. Mkpara Gi, Chineke, ya na mkpan'aka Gi, ha n'atasi m'obi. Odigh'ihe m g'acho, n'ezie, odigh'ihe koro mo. Verse Three Okwa Gi kwadooro m nnukwu oriri nke m gaeri n'iru nd'iro m. Chukwu, I tego m ude n'isi, eh! iko m ejula n'onu. Odigh'ihe m g'acho, n'ezie, odigh'ihe koro mo. Verse four N'ezie, obi oma na obi ebere Gi ga n'eso m ubochi ndu m nile. Aga m'ebi n'ulo nke Dinwenu, ubochi ndu m nile. Odigh'ihe m g'acho, n'ezie, odigh'ihe koro mo.

Download the sheet music

OBIAGELI

OBIAGELI

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
12 pages
5 Downloads
Offertory Hymns Hymns Responsorial Psalms
0 0

More lyrics you may want