Obi Sali Sali by Udo Laurence Iwu — Lyrics

Udo Laurence Iwu Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Bata n'ime m mee mu obi sali sali, bata n'ime m mee mu otu onye na ndị mmamma. Jesu m o biko bata n'obi m o biko, bịa medaa m obi o Jesu m o, obi m o bi, bata n'ime m o bịa julu m o. [VERSE 1] Bata ka I nye mu ndụ ọhụrụ, n'obi ka I nye mu ọṅụ ọhụrụ, bata ka I sachaa mu ka mu dị ọcha, wee soro na ndị bụ ndị nke Gị. [VERSE 2] Onye Jesu batara n'ime ya g'enwe obi dị ọcha, obi dị ọcha, obi dị mma, obi dị nsọ. Onye ahụ g'enwe obi dị mma, obi dị nsọ, k'o g'enwe obi dị sam sam, obi sali sali sali sali, maka na Jesu anaghị ebi ebe ruru unyi. [VERSE 3] Obi sali sali, obi yọlị yọlị, obi sali sali, obi yọlị yọlị, obi sali sali, obi yọlị yọlị, obi sali sali, obi yọlị yọlị. Obi yọlị yọlị, Jesu nọ n'obi sali sali, dị asọ, Jesu nọ n'obi sali sali, obi yọlị yọlị, obi yọlị yọlị. Eukaristia dị nsọ, yọlị yọlị, bịa bata n'ime ndụ, bịa nye mu ndụ ọhụrụ, bịa bata n'ime ndụ m o ka I doo m asọ, maka n'I bata n'ime ndụ m o, mu g'adị ọcha. I bata n'ime ndụ m o, a bụrụ m onye asachaworo n'ọbara Nwa atụrụ ahụ. Jesu Kristi yọlị yọlị, obi sali sali, bata sachaa, bata biri, obi yọlị yọlị, obi yọlị yọlị, obi sali sali, obi sali sali m o, o bịa julu m o, obi sali sali sali sali.

Download the sheet music

Obi Sali Sali

Obi Sali Sali

By Udo Laurence Iwu
Solfa
Igbo
6 pages
19 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want