Full Lyrics
REFRAIN
Ebe a bụ ebe dị egwu!
Nka a bụ Ụlọ Nsọ Chukwu,
Ọnụzọ nke eligwe.
Aga kpọ ya, Obieze Chukwu dị nsọ.
VERSE 1
O Nna ji ike nile,
Anyị abịago ịkpọ isiala nye Gị.
Meere anyị ebere.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 2
Anyị bịara n'iru Gị, Chineke,
Inye Gị ekele kwesịrị Gị,
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 3
Gee ntị, nụrụ olu anyị.
Gee ntị nụr'ekper'anyị.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 4
Anyị gaefe Gị ụwatụwa.
Biko, Chukwu mee k'anyị binyere Gị.
Ka ngọzi Gị rukwasị anyị Chineke.
Anyị bịara n'obi Gị, Chukwu.