Full Lyrics
REFRAIN
Ebea bụ ebe diegwu!
Nke a bụ Ụlọ Nsọ Chukwu,
Ọ n'ụzọ nke eligwe.
A g'akpọ ya Obi eze Chukwu dị Nsọ.
VERSE 1
O Nna ji ike nile,
Anyị abịago ịkpọ isiala nye Gị.
Meere anyị ebere.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 2
Anyị bịara n'iru Gị, Chineke,
Inye Gị ekele kwesịrị Gị.
Gee ntị, nụr'ekper'anyị.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 3
Gee ntị, nụrụ olu anyị.
Gee ntị, nụr'arịrịọ anyị.
Denye ah'anyị n'akwụkwọ ndụ.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 4
Anyị gaefe Gị ụwa tụwa,
Biko, Chukwu, mee k'anyị binyere Gị.
Ka ngozi Gị rukwasị anyị, Chineke.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.