OBI-EZE CHUKWU DI NSO by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ebea bụ ebe diegwu! Nke a bụ Ụlọ Nsọ Chukwu, Ọ n'ụzọ nke eligwe. A g'akpọ ya Obi eze Chukwu dị Nsọ. VERSE 1 O Nna ji ike nile, Anyị abịago ịkpọ isiala nye Gị. Meere anyị ebere. Anyị bịara n'obi Gị Chukwu. VERSE 2 Anyị bịara n'iru Gị, Chineke, Inye Gị ekele kwesịrị Gị. Gee ntị, nụr'ekper'anyị. Anyị bịara n'obi Gị Chukwu. VERSE 3 Gee ntị, nụrụ olu anyị. Gee ntị, nụr'arịrịọ anyị. Denye ah'anyị n'akwụkwọ ndụ. Anyị bịara n'obi Gị Chukwu. VERSE 4 Anyị gaefe Gị ụwa tụwa, Biko, Chukwu, mee k'anyị binyere Gị. Ka ngozi Gị rukwasị anyị, Chineke. Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.

Download the sheet music

OBI-EZE CHUKWU DI NSO

OBI-EZE CHUKWU DI NSO

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
1 page
3 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want