Full Lyrics
REFRAIN
Ebe a bụ ebe dị egwu!
Nke a bụ Ụlọ Nsọ Chukwu,
Ọn'ụzọ nke eligwe.
A g'akpọ ya, Obieze Chukwu dị Nsọ.
VERSE 1
O Nna ji ike niile,
Anyị abịago ịkpọ isiala nye Gị.
Meere anyị ebere.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 2
Anyị bịara n'iru Gị, Chineke,
Inye Gị ekele kwesịrị Gị.
Gee ntị, nụr'ekper'anyị.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 3
Gee ntị, nụrụ olu anyị.
Gee ntị, nụr'arịrịọ anyị.
Denye ah'anyị n'akwụkwụ ndụ.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.
VERSE 4
Anyị gaefe Gị ụwatụwa.
Biko, Chukwu, mee k'anyị binyere Gị.
Ka ngọzi Gị rukwasị anyị, Chineke.
Anyị bịara n'obi Gị Chukwu.