Full Lyrics
REFRAIN
Ebe a bu ebe di egwu
Nke a bu ulo nso Chukwu,
Onu zọ nke eluigwe.
A gaakpọ ya, obi eze Chukwu di nso.
VERSE 1
O Nna ji ike nile,
Anyi abiago ikpo isiala nye gi.
Meere anyi ebere.
Anyi biara n'obi gi Chukwu.
VERSE 2
Anyi biara n'iru gi, Chineke,
Inye gi ekele kwesiri gi.
Gee nti, nuru ekpere anyi.
Anyi biara n'obi gi Chukwu.
VERSE 3
Gee nti, nuru olu anyi.
Gee nti, nuru aririo anyi.
Denye aha anyi n'akwukwo ndu.
Anyi biara n'obi gi Chukwu.
VERSE 4
Anyi gaefe gi uwa tuwa.
Biko, Chukwu, mee ka anyi binyere gi
Ka ngozi gi rikwasia anyi, Chineke.
Anyi biara n'obi gi Chukwu.