Full Lyrics
REFRAIN
Ebe a bu ebe di egwu!
Nke a bu Ulo Nso Chukwu,
Onuzo nke eligwe.
A g'akpo ya Obieze Chukwu di nso.
VERSE 1
O Nna ji ike nile,
Anyi abiago ikpo isiala nye Gi.
Meere anyi ebere.
Anyi biara n'Obi Gi Chukwu.
VERSE 2
Anyi biara n'iru Gi, Chineke,
Inye Gi ekele kwesiri Gi.
Gee nti n'ekper' anyi.
Anyi biara n'Obi Gi Chukwu.
VERSE 3
Gee nti, nuru olu anyi,
Gee nti, nur' aririo anyi.
Denye ah' anyi n'akwukwo ndu.
Anyi biara n'Obi Gi Chukwu.
VERSE 4
Anyi ga efe Gi uwatuwa.
Biko, Chukwu mee k'anyi binyere Gi.
Ka ngozi Gi ruku n'isi anyi Chineke.
Anyi biara n'Obi Gi, Chukwu.