OBI-EZE CHUKWU DI NSO by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Entrance songs Hymns Consecration Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ebe a bu ebe di egwu! Nke a bu Ulo Nso Chukwu, Onuzo nke eligwe. A g'akpo ya Obieze Chukwu di nso. VERSE 1 O Nna ji ike nile, Anyi abiago ikpo isiala nye Gi. Meere anyi ebere. Anyi biara n'Obi Gi Chukwu. VERSE 2 Anyi biara n'iru Gi, Chineke, Inye Gi ekele kwesiri Gi. Gee nti n'ekper' anyi. Anyi biara n'Obi Gi Chukwu. VERSE 3 Gee nti, nuru olu anyi, Gee nti, nur' aririo anyi. Denye ah' anyi n'akwukwo ndu. Anyi biara n'Obi Gi Chukwu. VERSE 4 Anyi ga efe Gi uwatuwa. Biko, Chukwu mee k'anyi binyere Gi. Ka ngozi Gi ruku n'isi anyi Chineke. Anyi biara n'Obi Gi, Chukwu.

Download the sheet music

OBI-EZE CHUKWU DI NSO

OBI-EZE CHUKWU DI NSO

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
1 page
6 Downloads
Entrance songs Hymns Consecration
0 0

More lyrics you may want