Full Lyrics
INTRO
Chineke, lee ka ebe obibi Gị si maa nma.
REFRAIN
Obi dị Nsọ! Obi mara nma, Obi Chukwu!
Obi dị ngozi! Anyị abịago n'obi Gị!
Wusab'anyị ngozi Gị, Chineke, Igwe ndị agha.
Ndị Gị abịago n'iru Gị!
Wusab'anyị ngozi Gị, Chineke, Igwe ndị agha.
VERSE 1
Ot'ụbọchị na be Gị, Chineke, kacha nma
Karịcha nnu kwuru nnu n'eb'ọzọ.
VERSE 2
Ọ n'agụ m nnukwu agụụ ịbata n'obi Dinwenu.
Mkpul'obi m n'ahụ m, n'ekwere Chineke dị ndụ ukw'an̄ụrị.
VERSE 3
Nnụnụ eleke achọtaral'onwe ya eb'obibi.
Kpalakwukwu achọtag'akwụ maka ụmụ ya n'ebe Nchụaja Gị,
Chukwu nk'igwe ndị agha, Eze m na Chukwu m.
VERSE 4
An̄ụrị bụ nke ha, bụ ndị bi n'obi Gị,
N'ekwere Gị ukw'otito ụbọchị nile.