Full Lyrics
REFRAIN
Obele nwa Jesu nno! Nno!
Anyi n'ekele Gi.
Amuru Gi n'ulo anu, Chukwu!
Onye nzoputa anyi!
VERSE 1
Otego nnukwu aka ndi amuma
jiri zi anyi ozi
na a g'amuta r'anyi otu nwa;
Onye nzoputa anyi.
VERSE 2
Onye amum'Azaya kwuru si,
"Nwata nwagbogho g'aturu ime,
o g'amuta r'anyi otu nwa;
Onye nzoputa anyi."
VERSE 3
"Ihe a g'akpo Ya bu Ihunanya,
Onye ndumodu puru iche,
Chineke j'ike nile;
Onye nzoputa anyi."
VERSE 4
"Ihe a g'akpo Ya bu Immanuel,
Nna di ebebe,
Okpara Eze nk'udo, Chukwu;
Onye nzoputa anyi."