Obasi Emeka by NCHITA HYGINUS ARINZE — Lyrics

NCHITA HYGINUS ARINZE Igbo Celebrations Hymns Recessional / Dismissal Hymns Offertory Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Obasi emeka, afọma Chukwu ebuka, Ngozi Chukwu na ndụ m o baruba, Ọ zawo m ekpere, Ọ hichawo m anya ikwa, N'ibe bịa soro m kele Chukwu n'omeka. VERSE 1 Onyinye nke ndụ site n'afọ ruo n'afọ, N'ezi ahụike nke a hụ na mkpụrụobi, Ma n'ọ bụ n'akwụghị ụgwọ, Ọ nyere m ya n'efu, Ụmụnnem bịa soro m o k'anyị kele Obasi n'omeka. VERSE 2 Ọrụọma Chukwu n'arụrụ m o juru m anya, Amaghim ebe m g'ebido; amaghim ebe m g'akwụsị, Agam akọle gha r'ole na mmeso ọma ya, Ngozi Chukwu karịrị ọgụgụ, Obasi emeka. VERSE 3 Ọ bụ onyinye g'onyere m o, k'ọ bụ onyinye nwa, Ọ bụ ọgụgụ isi, k'ọ bụ mma ọ chọrọ m o. N'okpor'ụzọ nile Ọ duru m je'eje wee lọta; Afọma Chukwu erika, Obasi emeka.

Download the sheet music

Obasi Emeka

Obasi Emeka

By NCHITA HYGINUS ARINZE
Solfa
Igbo
2 pages
0 Downloads
Celebrations Hymns Recessional / Dismissal Hymns Offertory Hymns
0 0

More lyrics you may want