Full Lyrics
[INTRO]
Nyenụ Messiah, Messiah, nyenụ Messiah, Messiah.
Nyenụ Messiah, ụnụ ụmụ Chineke.
Nyenụ Messiah, Messiah, nyenụ Messiah, Messiah.
Nyenụ Messiah nsọpụrụ na ike.
[SECTION A]
Nyenụ Messiah, ụnụ ụmụ Chineke,
Nyenụ Messiah, Messiah, ụnụ ụmụ Chineke.
Nyenụ Messiah nsọpụrụ, nsọpụrụ,
Doo nyenụ Ya doo.
Nyenụ Messiah nsọpụrụ na ike.
Nyenụ Messiah nsọpụrụ aha Ya.
Kpọọnụ isiala nye Messiah n'ịma mma nke ịdị nsọ.
[VERSE 3]
Olu Messiah dị n'elu mmiri,
Chineke nke ebube naagba egbe eluigwe,
Messiah nọ n'elu ọtụtụ mmiri.
[VERSE 4]
Olu Messiah naada n'ike n'ike, n'ịma mma.
Olu Messiah naetiwa osisi Cedar.
Messiah wee tiwasịa, tiwasịa osisi Cedar nke Lebanon.
[SECTION 6]
Ọ naeme ka ha naawụlị elu dika nwa ehi,
Bụ Lebanon na Sirion dika nwa ehi.
[SECTION 7]
Olu Messiah naewepụta ire ọkụ.
[SECTION 8]
Olu Messiah naeme k'ọzara mee mkpọtụ.
Messiah naeme k'ọzara Kedesh mee mkpọtụ.
[SECTION 9]
Olu Messiah naeme ka ime naeme nne ele,
Ọ naekpocha ọhịa k'ọ gba ọtọ.
N'ụlọ ukwu Ya, ihe nile naasị EBUBE!
Ihe nile naasị EBUBE!
EBUBE! Ihe nile naasị EBUBE!
[VERSE 1011]
Messiah nọdụrụ n'oche eze,
Ọ nọdụrụ n'oche eze n'iju mmiri ahụ.
Messiah wee nọdụ, wee nọdụ dika eze ruo mgbe ebighị ebi.
Messiah gaenye ndị Ya ike,
Messiah gaeji udo gọzie ndị Ya.
EBUBE! EBUBE!
Ihe nile naasị EBUBE!
Ihe nile naasị EBUBE!