NYELUM AKA, O MARIA — Lyrics

Igbo Marian Hymns Baptism Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Ekwelum nkwa na mbọchị baptisma N'agamefe Chukwu n'elu ụwa N'agam eche nti n'okwu nke nzụkọ N'agam ajụ otito nke ajọ mụọ. CHORUS Nyelum aka O Maria Kam wedebe ihe m kwere na nkwa Nyelum aka O Maria Kam wedebe ihe m kwerena nkwa VERSE 2 Maka Onwe Ya ka Chukwu ji ke anyị, K'anyị mara Ya wee hụ Ya n'anya K'anyị were obi fee Ya n'elu ụwa, Iji binyegoro Ya n'ụwa ọzọ. VERSE 3 Onye Okike kechara anyị yie Ya, Na mkpụr'obi, anyị yirị Chukwu Ma site na mmiri nke Baptisma, Amụr'anyi ka ụmụ nke Chukwu. VERSE 4 Aja nkiti Chukwu ji ke mmadụ Aja nke jupụtara na adi ike. Baptisma mer' anyị ụmụnna Jesu, Ndi ga eketa aṅụrị nke eluigwe. VERSE 5 Ahụhụ anyị na ata ga n'elu ụwa, Nchekasị n'olu dịgar' anyị Ililo n'okwu n'omume nile, Gabụ ihe a na eji efe Chukwu.

Download the sheet music

NYELUM AKA, O MARIA

NYELUM AKA, O MARIA

Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Marian Hymns Baptism Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want