Full Lyrics
Chukwu anyị abịawo e, anyị abịawo kwa e
Olisa bi n'igwe biko nụrụ ekpere anyị o
Olisa bi n'igwe, ọ kwa sị bụ mgboro gwa anyị o
Olisa doh biko, Olisa doh biko
Bịa e nụrụ nụ e ekpere anyị o
Doh biko nụrụ ekpere anyị o
Olisa bi n'igwe biko nụrụ ekpere anyị o
Olisa bi n'igwe biko nụrụ ya o anyị o
A naanụrụ nwa nyo e, nụrụ nwa nyo ewo
Ya dịkwara nwa kemma dịkwa nwa nyo nwa nyo
Olisa doh, Olisa doh
Egbe belu ugo, egbe belu o, ugo belu e
K'anyị rịọ Olisa
Doh biko nụrụ ekpere anyị o
Olisa doh biko nụrụ ayịyọ anyị o
Olisa doh biko, Olisa doh biko
Nụrụ akwa anyị o, akwa anyị o
Ogonogo ndụ, ogonogo ndụ n'ahụ isike ka anyị naayọ
Anyị naayọ, anyị naayọ
Maka na ndụ bụ isi, ndụ bụ isi, na ndụ bụ isi e
Chukwu e, Onye nwe anyị e, nụrụ ekpere anyị o
Chetakwa na Chukwu n'ama dịgị aka anyị eweghịkwa onwe anyị
Mana n'o Chukwu bụ ike anyị o, biko bịa zie zanụ anyị o
Olisa bi n'igwe nyenụ anyị udo
Maka na udo na ịdị n'otu n'eweta ọganiru
Biko zie Olisa doh nụrụ ekpere anyị o
Ihe ọma e, ihe dị mma e rutunụ anyị aka
Ihe ọma e, ihe dị mma e rutunụ anyị aka
Olisa doh nụrụ ekpere anyị o
Olisa doh nụrụ ekpere anyị o
Biko zie nụrụ ekpere anyị o
Ma gozie anyị o, ma gozie anyị o
Biko gozie anyị o, gozie, gozie, gozie doh
Ise, ise